New York City

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jump to navigation Jump to search

New York bu ama ukwu kárírí ívu mádu na Njikota Obodo Amerika, na etítì ama sárá nke New York, nke bu ótụ na ùwà kárírí madu. Bu ama oganiru, New York nwèrè íké na áhiá ùwà nílé, nká, oménàlà, ndọùwé, ọtúihe, ómúmú, na mmemmé. Ka onye jídéré Íshí Ọtú Mbà, ọ di kwà mkpà na ihe ne me na ùwà. Ha na kpo ámá nke New York City ma ọ bu City of New York Í me ka ya na nkeji obodo New York gị dị ichè, nke ọ nọr.

Dí nà ébé ugbọ na bía di na ikpele mmiri nke Atlantic nke Olile owuwa Nkeji Obodo, ama nke nwèrè nkeji ise: The Bronx, Brooklyn, Manhattan, Queens, na Élú mmiri Staten. Ha kàrà àkà na 2008 sí na ama nke nwèrè mádu gáfè nde 8.3, na nke àlà gbárá gburụ gbúrụ nke mile 305 (790 km2), New York City bu ébé mádu nọkọtàrà ká ama ndi ozor na Nkeji Obodo. Ama sárá nke New York nwèkwàrà mádu ká ébé ndi ozor na mgbà áhù, nwé mád ha kà àkà nde 19.1 na gbụrụ gbúrụ mile 6,720 (17,400 km2). Na nke ozor, nke Njikota Kà Àkà Gbúrù nwéré ama sárá New York nwèrè mádu rúrú nde 22.2 na afọr 2009 nke ỌgúMádu kàrà àkà, na nke kárírí kwa na Njikota Obodo.